Rhapsody Global Club ( Mandate 1B ROR Influences )
Rhapsody Global Club ( Mandate 1B ROR Influences )
June 8, 2025 at 08:20 PM
Rhapsody Igbo Mon Jun 09 2025 IKE NKE ONYE NA EZI ỤZỌ Onye ahu buru uzọ chọta nwa-nne nke aka ya, bú Saimon, si ya, Ayi ahuwo Mesaia-ayi (nke bu, ma asugharia ya, Kraist). O duru ya biakute Jizọs ( Jọn 1:41-42) N'ọrụ nke ịbawanye Alaeze Chineke, onye na ezi ụzọ dị mkpa, anyị na-ahụ na e nwere ndị dị otú ahụ na Baịbụl, karịsịa na Oziọma Jọn. Ndị a abụghị naanị ụmụazụ Jizọs Kraịst nnọọ ma ha na-akwalite ije ozi ya. Omume ha gosipụtara ụdị ọrụ pụrụ iche nke onye na ezi ụzọ na ebe ọ kachasị mma. Dịka ọmụmaatụ, na Jọn 1: 40-42, anyị na-ahụ Andru, otu n'ime ndị na-eso ụzọ Jọn onye Baptist onye hapụrụ ihe ọ bụla naeso Jizọs. Andru edobeghị mkpughe ọhụrụ ya ka ọ dịrị nanị ya. Ozugbo ọ chotara nwanne ya nwoke, Saimon (Peter), kwusaara ya, "Anyị ahụwo Mesaya ahụ!" Mgbe ahụ ọkpọrọ Pita kpọgara wetara Jizọs. Ihe Andru mere, na-egosi obi nke ezi onye na ezi ụzọ - onye na-amụba ma na-akwalite ozi Jizọs site n'inye ndị ọzọ ohere isonyere ya ma rụọ ọrụ Ya. N'echi ya, Jizọs kpọrọ Filip ka ọ soro ya. Filip, dị ka Andru,, edebeghị ozi ọma ahụ nye onwe ya. Ọ chọtara Nataniel, si, Anyi ahuwo Ya onye Moses n’ime iwu na ndi-amuma ndị ọzọ dere banyere Ya, Jizsọ nke Nazaret, nwa Joseph.” Natanael, na enweghị nmasị na nke mbu, juru, "Ezi ihe ọ bụla ọ pụrụ isi na Nazaret pụta?" Nzaghachi Philip dị mfe, ma dịkwa ike; Ọ si Nataniel,”bia hu”, (Jọn 1: 45-46). Nke a bụ ike nke onye na ezi ụzọ. Andru na Filip esoghị Jizọs nanị, ha kpọtara ndị ọzọ na ebe ọdị ukwuu. Ha jikọrọ ndị Juu na ibe ha na ndị ji ha kpọrọ ihe, ndị kwerela na Chineke, bata na ije ozi nke Mesaya. N'otu aka ahụ, na- ịbawanye Alaeze Chineke taa, anyị chọrọ ndị agha nke Chineke na ebe ọdị ukwuu ndị tinyere onwe ha, na anụokụ, na enweghị ụjọ na mkpebi ha banyere Ozioma ahụ. Anyị na-ekwusa ozi ọma na izu oke ya n'afọ 2025. Bụrụ onye onye na ezi ụzọ na ozi a! Debanye aha ma gba ndị ọzọ ume iso nye dika anyi na emezu Iche ọzia di ukwu. Ọ bụ ihe dị mkpa ka anyị mata na tupu anyi enwe mgbenwe na ụwa anyi, anyi chọrọ ndị agha bụ ndị nke Krist nwere otu obi, onye ọbụla na eme akuku nke ya na ịmụbanye Alaeze Chineke, kariacha ugbua Onyenweanyi na abiaghchị nsonso. Prayer / Confession Ezigbo nna, daalụ maka ime ka m bụrụ onye na ezi ụzọ n'ọganihu nke alaeze gị. Site na mụ onwe m, a na-akpọbata ọtụtụ n'ime Alaeze ahụ ma banye n'ime ndị agha gị dị ukwuu, na-emezu nzube Chineke na ịgbanwe ndụ gị ebe niile. M na-eje ije n'amamihe na ike nke mmụọ nsọ, na-agbasa ike nke Alaeze ahụ, n'Aha Jizọs. Amen. Further study Jọn 1:40-42; Jọn 4:28-30; 2 Timọti 2:2 1-year bible reading plan Ọlụ NdịOzi 1:1-26 & 2 Ihe E Mere 1-4 2-year bible reading plan Mak 16:1-11 & Ditọrọnọmi 7 WhatsApp Chanel for rhapsody Translation : https://whatsapp.com/channel/0029Va9SJ9OHFxP0Xh4KCN3F

Comments