
Rhapsody Global Club ( Mandate 1B ROR Influences )
June 13, 2025 at 07:00 PM
Rhapsody Igbo
Sat Jun 14 2025
IKE NKE ỌHỤỤ NA ỊTUGHARỊ UCHE
Jekob we chiri n'onwe-ya nkpa-n'aka nke osisi poplar di ndu, na nke osisi hazel, na nke osisi chesnut; o kpechaputa ebe di ọcha nime ha, nēme ka ọcha nke di nime nkpa-n'aka ahu puta ìhè (Jenesis 30:37).
Akuko Jekọb na Jenesis 30 na 31 bụ ngosipụta na-adọrọ mmasị nke ike nke ọhụụ na ichepụta ihe. Mgbe Jekọb kwetara ịrụrụ Leban ọrụ, e kwere ya nkwa ịnye ya ehi dịka ụgwọ ọrụ. N’agbanyeghị, Leban gbanwere okwu ahụ ugboro n’ugboro ma ghọgbụọ Jekọb. Ma Jekob, sitere na amamihe nke Chineke na uzo okike nke Chineke, wee tụgharịa ọnọdụ ya.
Jekọb were osisi poplar dị ndu, hazel, na chestnut, ma kpechapụta ebe dị ọcha n’ime ha. O tinyere mkpanaka ndị a n'ebe agba mmiri, ebe ìgwè ewu nābịa añụ mmiri. Dịka anụmanụ ndịa na-enwe mmerikọta n'ihu mkpanaka ahụ, ha mụrụ ụmụ ha dịka Jekob si chọ. Dịka oge nāga, mgbe Jekob n’enweghị ihe o ji osisi ndị ahu o kpechapụtara eme ihe, o kewara ha. O kewapuru umu anumanu ndị ahu bụ ndị nwere ntupọ, nke ọ bula nke nwere ọcha n’ime ya, na nke ọ bula di nji, ma debe kwa ha n'iru anu-ehi ndị gbasiri ike. Site n'ime nke a, o nyere ìgwè atụrụ ahụ ọhụụ, ma me ka ha tụrụ ime ma mụọ nwa dịka ihe ha hụrụ.
Ihe a Jekob mere bụ ngosipụta ike nke ọhụụ. O jiri ikike iche echiche ya gbanywe ihe ga-esi na ya pụta. Mgbe umu anumanu ndị gbasiri ike tụrụ ime, Jekob dotere mkpanaka ahụ n’ihu ha, bụ nke mere ha ji mụọ ụmụ gbasiri ike ma dị nma n’anya. N’ebe anumanu ndị na-enweghị ike nọ, ọ naghị eji mkpanaka ahụ, ya mere ndị na-adịghị ike ji bụrụ nke Leban.
Dịka oge na-aga, umu anumanu Jekọb bịara dị ike ma baa ụba ebe ọ dị ukwuu, ebe ndị nke Leban bụ ndị na-adịghị ike. Ihe ịga nke ọma a bụ nke Jekọb nwetere sitere na mkpughe nke Chineke nyere ya. Na nrọ, ọ hụrụ ebule ndị ahụ niile nke nāb͕ a ìgwè ewu niile na ha dị ọcha, tu kwa agwa, ma tu kwa akika. Otu mmụọ ozi gosipụtara ọhụụ a, nāsị, "Ọ si, welie anya-gi abua, hu, nkpi niile nke nāb͕a ìgwè ewu dị ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika: n'ihi na ahuwom ihe niile Leban nēme gi." (Jenesis 31: 12).
Lee ka ihe a si dị mkpa! ḷ nwere ikike ikepụta ihe ị chọrọ site n’ilekwasi anya na ihe ahụ ịchọrọ ịhụ. were uche gị mepụta ọhụụ ahụ ị chọrọ. Site n'Okwu Chineke na ike nke Mmmụọ Nsọ nke na-arụ ọrụ n'ime gị, ị nwere ike ịmepụta ma ọ bụ na-akpụzi n’edozi ndu gị. Hallelujah!
Prayer / Confession
Ezigbo nna, a na m ekele Gị maka inye m ikike ịhụ ma mepụta ọdịnihu m chọrọ site na ike nke ọhụụ na Okwu gị. Dịka m na-eji ike ọhụụ nke Mmụọ gị kwadoro, m na eme ka ndu m nọkọọ dịka nzube gị gbanyere ndu m si dị, bụ nke juputara na mmeri na mgbasawanye na mpaghara niile. Enyewo m ike na-emetụta ụwa m ma mezuo akaraka m, n'Aha Jizọs. Amen.
Further study
Jenesis 13:14-17; Habakụk 2:2; Ndị Efesọs 3:20
1-year bible reading plan
Ọlụ NdịOzi 4:32-5:1-11 & 2 Ihe E Mere 20-22
2-year bible reading plan
Luk 1:39-56 & Ditọrọnọmi 12
WhatsApp Chanel for rhapsody Translation :
https://whatsapp.com/channel/0029Va9SJ9OHFxP0Xh4KCN3F